Jeremiah 15

1Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ. 2Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ,
ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu;
ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu,
otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’
3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.

5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?
Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?
Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
6Gị onwe gị ajụla m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.
Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.
Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.
Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ ọzọ

7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha
nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.
Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.
Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.
Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi
bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;
na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya
na ihe oke egwu bịakwasị ha.
9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,
kubie ume.
Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,
ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.
Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ
site na mma agha ndị iro ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,
onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.
O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,
ma mmadụ niile na-akọcha m.
11 Onyenwe anyị kwuru sị,

“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,
aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ
nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.

12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,
ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?

13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,
nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.
Nʼihi na mmehie gị niile
ejupụtala nʼala a niile.
14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.
Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.
Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ
nke ga-eregbu gị.”

15Ị maara O Onyenwe anyị,
ya mere cheta m, lekọtaakwa m.
Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.
Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.
Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.
16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.
Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,
nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.
Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.
A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.
I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.
18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?
Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?
Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,
dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,
ime ka i guzokwa nʼihu m.
Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu
ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.
Ndị a ga-alaghachikwute gị
ma i gaghị alaghachikwuru ha.
20Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.
Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.
Ha ga-ebuso gị agha,
ma ha agaghị emeri gị
nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,
nakwa ịzọpụta gị,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
21“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.
Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”
Copyright information for IboBIU